-
Levitikọs 26:3-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 “‘Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru, na-edebe ihe m nyere n’iwu ma na-eso ha,+ 4 m ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị.+ Ala ga na-amị mkpụrụ ya.+ Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha. 5 Unu ga-azọchagide mkpụrụ ruo n’oge unu ga-aghọwa mkpụrụ vaịn. Unu ga-aghọgidekwa mkpụrụ vaịn ruo n’oge unu ga-aghawa mkpụrụ. Unu ga na-eri nri unu rijuo afọ. Unu ga-ebikwa n’ala unu, obi eruo unu ala.+
-