-
Aịzaya 2:3, 4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ọtụtụ ndị ga-ejekwa, sị:
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,
Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.
Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+
4 Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe,
Doziekwara ọtụtụ ndị okwu ha.
Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,
Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+
Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.
Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+
-
-
Aịzaya 11:6-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Anụ ọhịa wolf* na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo.+
Agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ọdụm na anụ gbara agba ga-anọkọkwa.*+
Nwatakịrị ga na-edukwa ha.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ ahịhịa.
Ụmụ ha ga-amakpukọkwa.
Ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi.+
8 Nwa na-aṅụ ara ga-egwuri egwu n’ọnụ agwọ ubí nọ,
Nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ agwọ ọjọọ nọ.
-