19 “‘Onye na-ekpe onye mbịarambịa ma ọ bụ nwa na-enweghị nna* ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ+ ikpe na-ezighị ezi,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+