29 N’oge Pika na-achị Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria lụsoro obodo ụfọdụ agha ma weghara ha. Obodo ndị ahụ bụ Aịjọn, Ebel-bet-meaka,+ Janoa, Kidesh,+ Hezọ, Gilied,+ na Galili, ya bụ, obodo Naftalaị niile.+ Ọ dọkwaara ndị bi n’obodo ndị a n’agha laa Asiria.+
6 N’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria,+ dọrọkwa ndị Izrel n’agha+ laa Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan,+ nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+
11 Eze Asiria mechakwara dọrọ ndị Izrel n’agha laa+ Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan, nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+
26 N’ihi ya, Chineke Izrel mere ka Pul, eze Asiria,+ (ya bụ, Tilgat-pilniza,+ eze Asiria), gaa dọrọ ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase n’agha ma kpọga ha Hela, Hebọ, Hera, nakwa n’akụkụ osimiri Gozan,+ ha ebiri ebe ahụ ruo taa.