-
Aịzaya 56:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ndị mba ọzọ, ndị bịara ka ha soro na-efe Jehova,
Ka ha hụ Jehova n’anya, jiri aha ya kpọrọ ihe,+
Bụrụkwa ndị ohu ya,
Ndị niile na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ndị na-anaghịkwa emerụ ya,
Ndị na-ahapụghịkwa ọgbụgba ndụ m,
7 M ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+
Meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.
M ga-anabata àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ ha ga-achụ n’elu ebe ịchụàjà m.
N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile.”+
-
-
Zekaraya 8:22, 23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Ọtụtụ ndị na mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha na Jeruselem,+ rịọkwa Jehova ka o meere ha amara.’*
23 “Ihe a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘N’oge ahụ, mmadụ iri ndị na-asụ asụsụ* niile e nwere ná mba dị iche iche+ ga-ejide uwe* onye Juu.* N’eziokwu, ha ga-ejide ya, sị: “Anyị ga-eso unu,+ n’ihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.”’”+
-