6 N’ihi na a mụụrụ anyị otu nwa,+
E nyere anyị otu nwa nwoke.
Ọchịchị ga-adị n’aka ya.+
A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chi Bụ́ Dike,+ Nna Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.
7 Ọchịchị ya ga-eru ebe niile.
Udo agaghịkwa akwụsị ịdị+
N’ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya.
A ga-eme ka alaeze ya sie ike+ ma dịgide
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi,
N’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi,+ na-emekwa ezi omume.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.