-
2 Ihe E Mere 36:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nọkwa na-ezigara ha ndị ozi ya ka ha dọọ ha aka ná ntị. Ọ dọrọ ha aka ná ntị ugboro ugboro, n’ihi na ihe gbasara ha na ụlọ nsọ ya* na-emetụ ya n’obi. 16 Ma, ha ji ndị ozi ezi Chineke+ na-eme ihe ọchị. O nweghịkwa ihe ha ji okwu ya kpọrọ.+ Ha nọ na-akwa ndị amụma ya emo+ ruo mgbe hanwa na-akwa emo na-enweghịzi mmekwata. Mgbe ahụzi ka Jehova wesara ha ezigbo iwe.+
-