-
Joshụa 1:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 “Nwee nnọọ obi ike, dịkwa ezigbo ike. Leziekwa anya na-eme ihe niile dị n’Iwu Mosis ohu m nyere gị. Ahapụla ime ya,+ ka i wee na-akpa àgwà onye ma ihe n’ihe ọ bụla ị na-eme.+ 8 Akwụsịla ịna-ekwu gbasara ihe e dere n’akwụkwọ Iwu a.+ I kwesịrị ịna-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya* ehihie na abalị, ka i wee lezie anya na-eme ihe niile e dere na ya.+ Ime ihe ndị a ga-eme ka ihe na-agaziri gị, meekwa ka ị na-akpa àgwà onye ma ihe.+
-