10 Eze mekwara ka a gharazie ịnọ na Tofet,+ nke dị na Ndagwurugwu Ụmụ Hinọm,*+ na-efe ofufe, ka onye ọ bụla ghara ịkpọ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ọkụ, jiri ya chụọrọ Molek+ àjà.
32 “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihi ya, oge na-abịa mgbe a na-agaghịzi na-akpọ ya Tofet ma ọ bụ Ndagwurugwu Nwa Hinọm,* kama, a ga na-akpọzi ya Ndagwurugwu Igbu Mmadụ. A ga na-eli ozu na Tofet ruo mgbe ebe a ga-eli ozu na-adịghịzi.+