66 Ihe ndị ga-ata isi unu ga-agba unu gburugburu, ụjọ ga na-atụkwa unu abalị na ehihie. Unu agaghị eji ndụ unu n’aka. 67 N’ụtụtụ, unu ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ mgbede!’ Ná mgbede, unu ga-asịkwa, ‘A sị nnọọ na ọ bụ ụtụtụ!’ n’ihi na unu ga-achị obi unu n’aka nakwa n’ihi ihe anya unu ga-ahụ.