-
2 Ndị Eze 18:19-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Rabshake wee sị ha: “Biko, gwanụ Hezekaya, sị, ‘Eze ukwu, bụ́ eze Asiria, sịrị: “Gịnị kara gị obi?+ 20 Ị na-asị, ‘M nwere ndị agha ga-alụ agha a. M haziekwala otú m ga-esi alụ ya.’ Ma, ihe ị na-agba bụ égbè ọnụ. Ònye ka ị tụkwasịrị obi, mere obi ji kaa gị gị enupụrụ m isi?+ 21 Ndị ị tụkwasịrị obi na ha ga-enyere gị aka bụ ndị Ijipt,+ ndị dị ka ahịhịa amị huuru ehuru, nke ọ na-abụ mmadụ jide aka, ya agbajie, dụpuo onye ahụ aka. Otú ahụ ka Fero eze Ijipt na-eme ndị niile tụkwasịrị ya obi. 22 Ọ bụrụkwanụ na unu asị m na unu tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke unu obi,+ ọ́ bụghị ya bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu a rụụrụ ya nakwa ebe ịchụàjà ya,+ ma gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘N’ihu ebe ịchụàjà nke a dị na Jeruselem ka unu ga na-akpọ isiala’?”’+ 23 Biko, gị na onyenwe m bụ́ eze Asiria tie n’aka, ka m nye gị puku ịnyịnya abụọ (2,000) lee ma mmadụ ole i nwere na-agba ịnyịnya hà ga-ezu ịgba ha.+ 24 Ebe ị tụkwasịrị ndị Ijipt obi na ha ga-enye gị ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, oleezi otú ị ga-esi nwee ike ịchụghachi otu gọvanọ azụ, ọ bụrụgodị otu n’ime ndị gọvanọ a na-anaghị anụ aha ha na-ejere onyenwe m ozi? 25 Ọ́ bụghị Jehova nyere m ikike ịbịa lụso obodo a agha ma bibie ya? Ọ bụ Jehova sịrị m, ‘Gaa lụso obodo a agha, bibiekwa ya.’”
-