-
2 Ndị Eze 18:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 Elayakim nwa Hilkaya na Shebna+ nakwa Joa gwaziri Rabshake,+ sị: “Biko, gwawa ndị ohu gị okwu n’asụsụ Arameik,*+ n’ihi na anyị na-anụ ya. Agwala anyị okwu n’asụsụ ndị Juu n’ihi na ndị a nọ n’elu mgbidi na-anụ ya.”+ 27 Ma Rabshake sịrị ha: “Ọ̀ bụ naanị unu na onyenwe unu ka onyenwe m ziri m ka m gwa ihe ndị a? Ndị a nọ ọdụ n’elu mgbidi sokwa. Unu na ha ga-eri nsị unu, ṅụọkwa mamịrị unu.”
-