-
2 Ndị Eze 18:28-35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Rabshake wee kwụrụ na-ekwu okwu n’oké olu n’asụsụ ndị Juu, sị: “Nụrụnụ ihe eze ukwu, bụ́ eze Asiria, kwuru.+ 29 Eze kwuru, sị: ‘Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, n’ihi na ọ gaghị anapụtali unu n’aka m.+ 30 Unu ekwekwala ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Jehova obi mgbe ọ na-agwa unu, sị: “Jehova ga-anapụtarịrị anyị. A gaghịkwa enyefe obodo a n’aka eze Asiria.”+ 31 Unu egela Hezekaya ntị, n’ihi na eze Asiria kwuru, sị: “Chịlierenụ m aka elu ka mụ na unu mee udo, onye ọ bụla n’ime unu ga na-erikwa ihe si n’osisi vaịn ya na ihe si n’osisi fig ya, na-aṅụkwa mmiri si n’olulu mmiri ya, 32 ruo mgbe m ga-abịa kpọrọ unu laa n’ala dị ka ala unu.+ Ọka,* mmanya ọhụrụ, achịcha, ubi vaịn, osisi oliv, na mmanụ aṅụ juru n’ala ahụ. Unu ga-adịrịkwa ndụ na-aga, unu agaghịkwa anwụ. Unu egekwala Hezekaya ntị, n’ihi na ọ na-arafu unu, na-asị, ‘Jehova ga-anapụta anyị.’ 33 Ò nweela chi ọ bụla n’ime chi mba dị iche iche napụtara ala ya n’aka eze Asiria? 34 Olee ebe chi niile ndị Hemat+ na ndị Apad na-efe nọ? Olee ebe chi niile ndị Sefaveyim,+ ndị Hina, na ndị Iva na-efe nọ? Hà napụtara Sameria n’aka m?+ 35 Ole nke n’ime chi niile obodo ndị a na-efe napụtara obodo ha n’aka m, nke mere Jehova ga-eji napụta Jeruselem n’aka m?”’”+
-