6 N’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria,+ dọrọkwa ndị Izrel n’agha+ laa Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan,+ nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+
22 Ndị Izrel nọkwa na-eme ụdị mmehie niile Jeroboam mere.+ Ha akwụsịghị ịna-eme ha, 23 ruo mgbe Jehova chụpụrụ ndị Izrel n’ihu ya, otú o si n’ọnụ ndị amụma, bụ́ ndị ohu ya, kwuo.+ E sikwa n’Izrel dọrọ ha n’agha laa Asiria,+ ebe ha nọ ruo taa.