17 Jehova, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị eze Asiria alaala mba dị iche iche na mba nke ha n’iyi.+18 Ha agbaakwala chi ha ọkụ n’ihi na ha abụghị ezigbo chi,+ kama ha bụ osisi na nkume, ọrụ aka mmadụ.+ Ọ bụ ya mere ha ji nwee ike ibibi ha.
15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu ma ọ bụ si otú a rafuo unu.+ Unu atụkwasịkwala ya obi, n’ihi na ọ dịghị chi mba ọ bụla ma ọ bụ chi alaeze ọ bụla nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka m ma ọ bụ n’aka nna nna m hà. Oleezi otú Chineke unu ga-esi napụta unu n’aka m?’”+