36 Ma ha gbachiri nkịtị. Ha agwaghịkwa ya ihe ọ bụla, n’ihi na eze gwara ha, sị: “Unu atụpụrụla ya ọnụ.”+ 37 Ma Elayakim nwa Hilkaya, onye na-elekọta ezinụlọ eze, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, dọwara uwe ha ma bịakwute Hezekaya, gwa ya ihe Rabshake kwuru.