13 Ndị ahụ na-afụ opi na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-eto Jehova ma na-ekele ya. Ha ji opi, ájà, na ngwá egwú ndị ọzọ na-eto Jehova “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ka ha na-abụ abụ a, ígwé ojii bịara ju n’ụlọ ahụ, ya bụ, n’ụlọ Jehova.+