-
Jeremaya 21:7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 “‘Jehova kwuru, sị, “Nke a gachaa, m ga-akpọrọ Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo a, ndị nke ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ, nyefee n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.*+ Nebukadneza ga-ejikwa mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere. Ọ gaghịkwa enwere ha ọmịiko ma ọ bụ metere ha ebere.”’+
-
-
Jeremaya 34:18-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 M ga-enyefe ndị mebiri ọgbụgba ndụ m n’aka ndị iro ha, n’ihi na ha emeghị ihe mụ na ha kwekọrịtara mgbe anyị ji nwa ehi gbaa ndụ. Anyị gbara ndụ a mgbe ha bọwara nwa ehi ahụ ụzọ abụọ si n’etiti ya gafere.*+ 19 Ndị mụ na ha gbara ndụ a bụ ndị isi Juda, ndị isi Jeruselem, ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị nchụàjà, na ndị obodo a niile, ndị si n’etiti nwa ehi ahụ a bọwara abọwa gafere. 20 M ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.* Ozu ha ga-abụrụ nnụnụ na anụ ọhịa ihe oriri.+
-