2 Ihe E Mere 24:19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 19 Jehova nọkwa na-ezigara ha ndị amụma iji mee ka ha lọghachikwute ya. Ndị amụma ahụ nọkwa na-adụ ha ọdụ, ma ha egeghị ha ntị.+ Nehemaya 9:26 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 26 “Ma, ha nupụụrụ gị isi, meere gị isi ike+ ma leghara Iwu gị anya.* Ha gburu ndị amụma gị ndị dọrọ ha aka ná ntị ka ha laghachikwute gị. Ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe.+ Zekaraya 7:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Ma ha ekweghị ege ntị.+ Ha mere isi ike,+ ha kpọchikwara ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe.+
19 Jehova nọkwa na-ezigara ha ndị amụma iji mee ka ha lọghachikwute ya. Ndị amụma ahụ nọkwa na-adụ ha ọdụ, ma ha egeghị ha ntị.+
26 “Ma, ha nupụụrụ gị isi, meere gị isi ike+ ma leghara Iwu gị anya.* Ha gburu ndị amụma gị ndị dọrọ ha aka ná ntị ka ha laghachikwute gị. Ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe.+