19 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt.+ Ọ ga-eburu akụ̀ ndị dị na ya, kwakọrọkwa ọtụtụ ihe na ya. Ihe ndị a ga-adịzi ka ihe e ji kwụọ ndị agha ya ụgwọ.’
18 Ụbọchị ga-agba ọchịchịrị na Tihafnihis mgbe m ga-agbaji osisi yok Ijipt n’ebe ahụ.+ A ga-anapụ ya ike ya nke na-ebu ya isi.+ Ígwé ojii ga-ekpuchi ya. A ga-adọrọkwa obodo niile dị na ya n’agha.+