11 N’ihi na ọ bụ Eze Ọg onye chịrị Beshan bụ onye ikpeazụ fọrọ ná ndị Refeyim. Ọ bụ ígwè ka e ji rụọ ihe e ji dọsa ozu* ya. Ọ ka dịkwa na Raba, bụ́ obodo ndị Amọn. Ọ dị kubit* itoolu n’ogologo, dịrịkwa kubit anọ n’obosara, ma e jiri ezigbo kubit tụọ ya.
24 Mosis kenyekwara ebo Gad ala, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 25 Ala ha ketara bụ Jeza+ na obodo niile dị na Gilied, nakwa ọkara ala ndị Amọn+ ruokwa Aroa, nke dị n’ebe e si aga Raba.+
5 M ga-eme ka Raba+ bụrụ ebe kamel ga na-ata ahịhịa, meekwa ka ala ndị Amọn bụrụ ebe ìgwè ewu na atụrụ ga na-ezu ike. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.”’”