-
Ezikiel 21:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 “Nwa nke mmadụ, see otu ụzọ si n’otu obodo pụta, nke nwere ebe o ruru gbaa abụọ. Eze Babịlọn, onye ji mma agha na-abịa, ga-ahọrọ ụzọ nke ọ ga-esi n’ime ha abụọ. N’ebe ụzọ a gbara abụọ, senye ihe* ga na-egosi ebe e si abanye n’obodo abụọ ahụ. 20 Ị ga-esenyekwa ihe ga-egosi ụzọ a ga-esi jiri mma agha bata ma lụso Raba,+ bụ́ obodo ndị Amọn agha, nakwa ụzọ a ga-esi bata Jeruselem, bụ́ ebe a rụsiri ike,+ nke dị na Juda, ma lụso ya agha.
-