-
2 Ihe E Mere 36:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 O mere ka eze ndị Kaldia gaa lụso ha agha,+ jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ụlọ nsọ ha.+ O mereghị ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ, ma agadi ma onye na-adịkwaghị ike, ebere.+ Chineke nyefere ihe niile n’aka ya.+ 18 O buuru arịa niile dị n’ụlọ ezi Chineke, ma ndị nnukwu ma ndị obere, burukwa akụ̀ ndị dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ eze nakwa nke ndị o mere ndị isi. O buuru ha niile laa Babịlọn.+
-