-
2 Ndị Eze 24:17-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Eze Babịlọn chikwara Matanaya, bụ́ nwanne nna Jehoyakin,+ eze, ya anọchie ya. Ọ gbanwekwara aha ya, kpọwazie ya Zedekaya.+
18 Zedekaya dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Hamutal+ nwa Jeremaya onye Libna. 19 Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Jehoyakim mere.+ 20 Ihe mere ihe ndị a ji mee ndị bi na Jeruselem na ndị Juda bụ maka na ha nọ na-akpasu Jehova iwe ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya mechakwara nupụrụ eze Babịlọn isi.+
-