-
Diuterọnọmi 31:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Jehova gwara Mosis, sị: “Lee, oge ị ga-anwụ* eruwela. Ndị a ga-amalitekwa ịkpa àgwà ka ndị akwụna hapụ m gaa fee chi ndị mba ọzọ gbara ha gburugburu n’ala ahụ ha na-aga.+ Ha ga-ahapụ m+ ma mebie ndụ mụ na ha gbara.+ 17 N’oge ahụ, m ga-ewesa ha ezigbo iwe,+ m ga-ahapụkwa ha.+ Agaghịkwa m enyere ha aka*+ ruo mgbe e bibiri ha. Mgbe ọtụtụ nsogbu bịachaara ha, ha ataakwa nnukwu ahụhụ,+ ha ga-asị, ‘Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka na Chineke anyị anọnyereghị anyị mere nsogbu ndị a ji bịara anyị?’+
-