-
Diuterọnọmi 28:53-57Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
53 N’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala, unu ga-eri ụmụ* unu, ya bụ, anụ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ bụ́ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.
54 “Nwoke nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe kacha emetụ n’ahụ́ n’ime unu, agaghịdị emetere nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ụmụ ya ndị fọrọ afọ ebere. 55 Ọ gaghịkwa enyetụ ha anụ nwa ya nke ọ bụla ọ ga-eri, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ọzọ o nwere n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.+ 56 Nwaanyị nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe na-emetụkwa n’ahụ́, nke na-agaghịdị eche echiche ịzọ ụkwụ ya n’ala maka na ọ na-eme nwayọọ nwayọọ+ agaghị emetere di ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ebere. 57 Ọ gaghịdị enyetụ ha ihe ọ bụla na-esi n’ahụ́ ya apụta mgbe ọ mụchara nwa nakwa anụ ụmụ ndị ọ ga-amụ. Ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa n’ihi otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.
-
-
2 Ndị Eze 25:3-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ ahụ, ụnwụ bịara ka njọ+ na Jeruselem, ndị mmadụ ahụghịkwa nri ha ga-eri.+ 4 Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem.+ Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Eze gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 5 Ma ndị agha Kaldia chụwara ya, chụkwute ya n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ. 6 Ndị Kaldia jidere ya,+ kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. Ha makwara ya ikpe. 7 Ha gburu ụmụ ya ndị nwoke n’ihu ya. Nebukadneza rụkpọsịkwara Zedekaya anya, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn.+
-