-
2 Ndị Eze 25:13-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ndị Kaldia kụrisịrị ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova, gbukasịakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ dị n’ụlọ Jehova nakwa otu nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ a na-akpọ Oké Osimiri.+ Ha bukwaara ọla kọpa e ji rụọ ihe ndị a laa Babịlọn.+ 14 Ha bukọkwaara ite, shọvel, ihe ndị e ji emenyụ ọkụ, iko, na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ, ndị e ji arụ ọrụ n’ụlọ nsọ. 15 Onyeisi ndị nche ahụ bukọkwaara ihe ndị e ji agụrụ ọkụ na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo+ na ezigbo ọlaọcha rụọ.+ 16 A bịa n’ihe gbasara arịa niile Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova, ma ogidi abụọ ma nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma ihe ndị e ji ebu ihe, a gaghị atụli ọla kọpa o ji rụọ ha atụ̀, n’ihi na ha karịrị akarị.+
-