-
1 Ndị Eze 7:15-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ọ kpụrụ ogidi ọla kọpa abụọ.+ Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit iri na asatọ. E jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ nke ọ bụla n’ime ogidi abụọ ahụ gburugburu, ọ dị kubit iri na abụọ.+ 16 O ji ọla kọpa kpụọ ihe abụọ a ga-edokwasị n’elu ogidi ndị ahụ. Ogo otu n’ime ihe abụọ ahụ dị kubit ise, nke ọzọ dịkwa kubit ise. 17 E nwere ihe ndị e ji ụdọ ígwè kpaa e ji chọọ ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ mma.+ Asaa dị n’otu n’ime ha, asaa adịrị na nke ọzọ. 18 Ọ kpụkwara ihe yiri mkpụrụ pomigranet gburugburu otu n’ime ihe ndị ahụ a kpara akpa. Ọ kpụrụ ha ahịrị abụọ, jiri ha chọọ ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ mma. Otú ahụkwa ka o mere ihe abụọ ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ. 19 Ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị dị n’ebe e si abata yiri okooko lili. Ogo ha dị kubit anọ. 20 A kpụkwasịrị ihe ndị ahụ n’elu ogidi abụọ ahụ. Ha dị n’elu ihe dị gburugburu nke jikọtara ihe ahụ a kpara akpa na ogidi nke ọ bụla. N’ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke ọ bụla, e nwere ihe yiri mkpụrụ pomigranet dị narị abụọ (200) nke dị ahịrị abụọ gbaa gburugburu.+
-