-
2 Ndị Eze 25:18-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Onyeisi ndị nche ahụ kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà, na Zefanaya+ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 19 Ndị ọzọ ọ kpụụrụ n’obodo ahụ bụ otu onye na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onyeisi ndị agha, mmadụ ise nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị ndụmọdụ eze, odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị obodo ma a chọọ ịga agha, nakwa ụmụ nwoke iri isii ndị obodo ahụ, bụ́ ndị nkịtị fọrọ n’obodo. 20 Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche kpụụrụ ha kpụtara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla.+ 21 Eze Babịlọn wee gbuo ha na Ribla nke dị na Hemat.+ Otú a ka e si dọrọ ndị Juda n’agha pụọ n’obodo ha.+
-