-
2 Ndị Eze 25:27-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa iri na abụọ, n’afọ nke iri atọ na asaa a dọọrọ Jehoyakin+ eze Juda n’agha, Ivil-merodak eze Babịlọn si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin eze Juda.+ Ọ bụ n’afọ ahụ ka Ivil-merodak malitere ịchị. 28 O medara obi gwa Jehoyakin okwu, buliekwa ya n’ọkwá, ya akara ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babịlọn. 29 Jehoyakin wee yipụ uwe ndị mkpọrọ o yi. Ya na eze rikọwara nri na tebụl oge niile ọ dị ndụ. 30 Eze na-enyekwa ya nri ọ na-eri kwa ụbọchị oge niile ọ dị ndụ.
-