16 Gwanụ mba dị iche iche gbasara ya.
Kọsaanụ ya na Jeruselem.”
“Ndị nche si n’ala dị anya na-abịa.
Ha ga-etikwa mkpu agha iji lụso obodo ndị dị na Juda agha.
17 Ha agbaala Jeruselem gburugburu otú ndị na-eche ubi nche si agba ubi ha na-eche nche gburugburu,+
N’ihi na ndị bi na ya enupụrụla m isi.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.