-
Ezikiel 21:21, 22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 N’ihi na eze Babịlọn ga-akwụsị otu ebe ụzọ gbara mkpị, n’isi ụzọ abụọ ahụ, ka ọ gbaa afa. Ọ ga-ayọgharị akụ́. Ọ ga-ajụ arụsị* ya ase. Ọ ga-elerukwa imeju anụ anya. 22 Afa o ji aka nri ya gbaa gosiri na ha kwesịrị ịga Jeruselem, gaa busa ihe e ji akwatu mgbidi, kwuo ka e gbuo ndị mmadụ, tie mkpu agha, busakwa ihe a ga-eji kwatuo ọnụ ụzọ ámá, jiri ájá rụọ mgbidi, rụọkwa mgbidi ọ ga-eji nọchibido ya.+
-