Diuterọnọmi 32:37, 38 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 37 Ọ ga-asịzi, ‘Olee ebe chi ha dị iche iche nọ,+Ndị bụ́ oké nkume ha gbabara na ya ka ha chebe ha,38 Bụ́ ndị na-eri abụba anụ ndị ha ji chụọ àjà dị iche iche,*Na-aṅụkwa mmanya ha ji chụọ àjà mmanya?+ Ka ha bilie nyere unu aka. Ka ha bụrụ ebe unu ga-agbaba. Aịzaya 28:15 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 15 N’ihi na unu sịrị: “Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ.+ E nwekwara ihe anyị na ili* kwekọrịtara. Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,Ọ gaghị erute ebe anyị nọ,N’ihi na anyị emeela ụgha ebe mgbaba anyị. Anyị ejirila ụgha kpuchie onwe anyị.”+ Jeremaya 10:14 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 14 Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche na onye na-amaghị ihe. Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ. Ha anaghịkwa eku ume.*+
37 Ọ ga-asịzi, ‘Olee ebe chi ha dị iche iche nọ,+Ndị bụ́ oké nkume ha gbabara na ya ka ha chebe ha,38 Bụ́ ndị na-eri abụba anụ ndị ha ji chụọ àjà dị iche iche,*Na-aṅụkwa mmanya ha ji chụọ àjà mmanya?+ Ka ha bilie nyere unu aka. Ka ha bụrụ ebe unu ga-agbaba.
15 N’ihi na unu sịrị: “Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ.+ E nwekwara ihe anyị na ili* kwekọrịtara. Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,Ọ gaghị erute ebe anyị nọ,N’ihi na anyị emeela ụgha ebe mgbaba anyị. Anyị ejirila ụgha kpuchie onwe anyị.”+
14 Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche na onye na-amaghị ihe. Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ. Ha anaghịkwa eku ume.*+