-
Matiu 23:34, 35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 N’ihi ya, m na-ezitere unu ndị amụma+ na ndị ma ihe na ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.+ Unu ga-egbu ụfọdụ n’ime ha,+ kpọgidekwa ha n’osisi, unu ga-apịakwa ụfọdụ n’ime ha ihe+ n’ụlọ nzukọ unu, kpagbuokwa ha+ si n’obodo ruo n’obodo, 35 ka ọbara ndị ezi omume niile e gburu* n’ụwa wee dị n’isi unu, malite n’ọbara Ebel onye ezi omume+ ruo n’ọbara Zekaraya nwa Barakaya, onye unu gburu n’agbata ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà.+
-