-
2 Ndị Eze 24:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Otú a ka o si dọrọ Jehoyakin+ n’agha laa Babịlọn.+ Ndị ọzọ o si Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn bụ nne eze, ndị nwunye eze, ndị na-eje ozi n’obí ya, nakwa ndị nwere agba n’obodo. 16 Eze Babịlọn dọkwaara ndị dike niile dị puku asaa (7,000) n’agha laa Babịlọn, dọrọkwa otu puku (1,000) mmadụ, bụ́ ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.* Ha niile bụ ndị dike a zụrụ ịga agha.
-
-
Jeremaya 29:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, ndị nchụàjà, ndị amụma, na mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. 2 O zigara ya mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ,+ ya na nne eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem, nakwa ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.*
-