34 Fero Niko chikwara Elayakim nwa Josaya eze ka ọ nọchie Josaya nna ya. Ọ gbanwere aha ya, a kpọwazie ya Jehoyakim. Ma, ọ kpọọrọ Jehoahaz kpọta Ijipt,+ ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ nọ nwụọ.+
4 Eze Ijipt chikwara Elayakim nwanne Jehoahaz eze Juda na Jeruselem. Ọ gbanwere aha ya, a kpọwazie ya Jehoyakim. Ma, eze a bụ́ Niko+ kpọọrọ Jehoahaz nwanne Elayakim kpọta Ijipt.+