25 Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+
65 Obi agaghị eru unu ala ná mba ndị ahụ,+ unu agaghịkwa ahụ ebe ụkwụ unu ga-ezu ike. Kama, Jehova ga-eme ka obi koro unu n’elu,+ ka ike gwụ anya unu, nakwa ka unu daa mbà n’obi.+