15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
48 Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi.
11 Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị fọrọ na Jeruselem n’agha, dọrọ ndị chịliiri eze Babịlọn aka elu ma na-akwadozi ya, dọrọkwa ndị ọzọ fọrọnụ.+12 Ma, ọ hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ka ha na-arụ ọrụ n’ubi vaịn nakwa n’ubi ọ bụla ọzọ a manyere ha ịrụ ọrụ.+