-
1 Ndị Eze 6:31-35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 O jikwa osisi paịn rụọ ibo ụzọ ọnụ ụlọ dị n’ime ime. Ọ rụkwara idé ndị dị n’akụkụ nakwa awara ụzọ, bụ́ ihe nke ise.* 32 O ji osisi paịn rụọ ibo abụọ ahụ, jiri ọlaedo machie ha, tụọkwa cherob, nkwụ, na okooko osisi n’elu ha. O jikwa ọlaedo ahụ machie cherob na nkwụ ndị ahụ. 33 O jikwa osisi paịn rụọ awara ụzọ nke anọ* e si abanye n’ụlọ nsọ.* 34 O ji osisi junipa rụọ ibo ụzọ abụọ. A na-esi ma n’ihu ma n’azụ emeghe ibo abụọ dị n’ọnụ ụzọ abụọ ahụ.+ 35 Ọ tụgasịrị cherob, nkwụ, na okooko osisi n’ibo ụzọ ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie ha.
-