-
Ezikiel 44:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
44 O mechara kpọghachi m n’ọnụ ụzọ ámá chere ebe ọwụwa anyanwụ ihu,+ nke dị ná mpụta ụlọ nsọ ahụ. Ma, o mechiri emechi.+ 2 Jehova gwakwara m, sị: “Ọnụ ụzọ ámá a ga-emechi emechi mgbe niile. A gaghị emeghe ya emeghe. Mmadụ ọ bụla agaghịkwa esi na ya abata n’ụlọ nsọ a, n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel, si na ya bata.+ Ọ ga-emechi emechi mgbe niile.
-