-
Ezikiel 10:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ndị cherob ahụ bụ ndị mmụọ ozi ahụ* m hụrụ n’osimiri Kiba.+ Ha na-ebili, 16 mgbe ha na-agakwa, wiil ndị ahụ na-eso ha aga. Ndị cherob ahụ welie nku ha ka ha si n’ala felie, wiil ndị ahụ dị n’akụkụ ha anaghị atụgharị atụgharị.+ 17 Ọ na-abụ cherob ndị a kwụrụ otu ebe, wiil ndị ahụ akwụrụkwa otu ebe. Ha bilie, wiil ndị ahụ esorokwa ha bilie, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dị n’ime ha.
-