14 Jehova kwukwara, sị, “M ga-akụpịa ha n’ahụ́ ibe ha, ma ndị bụ́ nna ma ụmụ ha.+ Agaghị m enwere ha ọmịiko. Agaghị m emere ha ebere. Ihe m ga-eme ha agaghịkwa ewute m. E nweghị ihe ga-egbochi m ịla ha n’iyi.”’+
11 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-ajụ unu, ebe ọ bụ na unu ji arụsị unu niile na-asọ oyi na arụ niile unu kpara merụọ ụlọ nsọ m.+ Agaghị m emere unu ebere.* Agaghịkwa m enwere unu ọmịiko.+