-
Daniel 8:23, 24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 “Ná ngwụcha ọchịchị ha, mgbe ndị na-emebi iwu mezuru mmehie ha, otu eze nke ihu ya na-emenye ụjọ, nke na-aghọtakwa okwu na-edoghị anya,* ga-amalite ịchị.* 24 Ọ ga-esi ezigbo ike, ma ọ gaghị abụ n’ike aka ya. Ọ ga-ala ọtụtụ ihe n’iyi. Ihe ọ na-eme ga na-agara ya nke ọma, ọ ga-emezukwa ihe dị ya n’obi. Ọ ga-ebibi ndị dike, bibiekwa ndị nsọ.+
-
-
Daniel 12:7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 M nụrụ ka onye ahụ yi uwe linin, onye guzo n’elu mmiri ahụ, zara ya. Mgbe ọ na-aza ya, o weliri aka nri ya na aka ekpe ya n’eluigwe ma jiri aha Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ṅụọ iyi,+ sị: “Ọ ga-adịru otu oge a kara aka, oge abụọ a kara aka, na ọkara otu oge.* Ozugbo a kụrisịrị ike nke ndị nsọ,+ ihe ndị a niile ga-emezu.”
-