33 M ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ M ga-emekwa ka ndị iro unu jiri mma agha bịa lụso unu agha.+ A ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo,+ bibichaakwa obodo unu dị iche iche.
6 N’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria,+ dọrọkwa ndị Izrel n’agha+ laa Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan,+ nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+
11 N’oge ahụ, Jehova ga-eji aka ya kpọkọta ndị ya nke ugboro abụọ, ya bụ, ndị ya fọrọ n’Asiria,+ n’Ijipt,+ na Patrọs,+ na Kush,*+ n’Ịlam,+ na Shaịna,* na Hemat, nakwa n’agwaetiti oké osimiri.+