-
Daniel 2:34, 35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Mgbe ị nọ na-ele ihe ahụ a kpụrụ akpụ anya, otu nkume a na-ejighị aka wapụta bịara kụọ ihe ahụ a kpụrụ akpụ n’ala ala ụkwụ ya ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ ma gwerie ya.+ 35 N’oge ahụ, e gweriri ígwè ahụ, ụrọ ahụ, ọla kọpa ahụ, ọlaọcha ahụ, na ọlaedo ahụ. Ha niile wee dịrị ka mkpo ọka* ndị dị n’ebe a na-azọcha ọka n’oge okpomọkụ. Ifufe wee buru ha bufuo, a hụghịzi ha ọzọ. Ma nkume ahụ nke kụriri ihe ahụ a kpụrụ akpụ ghọrọ nnukwu ugwu, gbasaakwa n’ebe niile n’ụwa.
-