16 Ma anụla m banyere gị, na i nwere ike ịkọwa ihe dị iche iche+ nakwa ihe tara akpụ. Ọ bụrụ na i nwere ike ịgụ ihe a e dere ma kọwaara m ihe ọ pụtara, a ga-eyiwe gị uwe na-acha pọpụl, yinye gị ihe olu ọlaedo n’olu, ị ga-abụkwa onye nke atọ na-achị n’alaeze a.”+