14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma na mbụ, abụghịkwa m nwa onye amụma. Kama abụ m onye na-azụ atụrụ+ nakwa onye na-elekọta* mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. 15 Ma, Jehova si ebe m nọ na-azụ atụrụ kpọrọ m. Jehova gwakwara m, sị, ‘Gaa buoro Izrel bụ́ ndị m amụma.’+
19 Ma Pita na Jọn gwara ha, sị: “Chegodịnụ ma ọ̀ ga-adị Chineke mma ka e gee unu ntị kama ige yanwa ntị. 20 Ma, anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.”+