3 Jehova sịrị: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume. Napụtanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya. Unu emekpala onye mbịarambịa ọ bụla ahụ́. Unu emesikwala nwa na-enweghị nna* na nwaanyị isi mkpe ike.+ Unu egbukwala* onye aka ya dị ọcha.+
“‘Kwụsịnụ tigbuo zọgbuo na mmegbu. Kpewenụ ikpe ziri ezi, mewekwanụ ezi omume.+ Kwụsịnụ ịnara ndị m ihe ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.