64 “Jehova ga-achụsasị unu ná mba niile, malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee, chi ndị unu na nna nna unu hà na-amaghị.+
12 Ma ọrịa na-efe efe ma ụnwụ ga-ala otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime unu n’iyi. A ga-eji mma agha gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ gburugburu obodo a.+ M ga-achụsasị otu ụzọ n’ụzọ atọ fọrọnụ ebe niile. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+