38 Pita agwa ha, sị: “Chegharịanụ,+ ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim+ n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu.+ Unu ga-anatakwa mmụọ nsọ Chineke na-enye n’efu.
12 Ma mgbe Filip nọ na-ezisa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke+ nakwa gbasara aha Jizọs Kraịst, ha nabatara ihe ọ nọ na-ekwu, e mee ha baptizim, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+